You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere eji chụọ ụkọchukwu Anglịkan n'Ezinifite - Aguata Dayọsis
Dịka ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ ihe kpatara ndị Ezinifite jiri gbachie ụlọụka Immanuel dị na be ha ụbọchị ụka, ọnụ na-ekwuru Dayọsis Anglịkan nke Agụata agwala BBC ebe mmiri siri banye n'akị oyibo.
Abuchi Nwozor sị na okwu ahụ malitere kemgbe afọ 2017 oge Dayọsis ahụ mechara nnyocha were chụọ ụfọdụ ụkọchụkwu "makana ha na-edina nwoke ibe ha."
"Ihe mezịrị bụ na ụkọchukwu na-ahụ maka Ezinifite, bụ Emma Ekejiuba, gara ebe a na-akwa ozu wee kwuo na otu n'ime ndị a achụrụ enweghị ihe o mere were kpọọ ya ka o soro ya kpee ekpere."