'Ihe mere ụmụ dị m jiri kụtụọ ụlọ m'
Ugbua, a malitela ịrụgharị ụlọ Nnennaya Okoriano.
Nwaanyị Ajadu aha bụ Nnenna Okoriano bi na Mgbom Agbani Ngwulangwu etiela mkpu maka etu ndị ọ kpọrọ ụmụ di ya nwụrụ anwụ si kpọta ndị agha ka ha kutuo ụlọ ya.
Nwaanyị ahụ kwuru na ugbu, ya na ụmụ ise ya bụ ndị na-enweghizi ụlọ mana ndị obodo kpọrọ ha nye ha ebe ha ga-anọgodu nwa mgbe nta.