Ndị isi ụlọmeiwu nta Naịjirịa na nke ndị Ghana enweela mkparịtaụka maka udo

Aha onyonyo, Nigeria VS Ghana: 'A gbachiela ọdọahịa ọtụtụ n'ime anyị na-agbanyeghị ijizu akwụkwọ a chọrọ'

Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila na ndị otu ya mere njem abalị abụọ na mba Gana maka inwe mkparịtaụka udo n'etiti mba abụọ ahụ.

Nke a na-eme dịka mba abụọ a na-agbarịta onwe ha egbe ọnụ maka okwu dapụtara na Gana ebe a na-achụgharị ụmụ Naịjirịa na-azụ ahịa ebe ahụ, ya na ụlọ nnọchịteanya ndị Naịjirịa a kụturu ebe ahụ.

Ndị so gaa ya bụ mkparịtaụka bụ Gbajabiamila n'onwe ya, Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka mba ofesi bụ Buba Yusuf, Onyeisioche kọmitii mgbasaozi bụ Benjamin Kalu, Onye otu ọgbakọ Economic Community of West African States (Ecowas) bụ Bayo Balogun, ya na Ikenna Elezieanya, Ephraim Nwuzi, na Balarabe Shehu.

Nzụkọ ndị omeiwu Naịjriịa na Gana

N'okwu ya, onyeisioche ụlọomeiwu nta ndị Gana bụ Ọkammụta Mike Oquaye kelere ndị ogbo ya nke Naịjrịa maka ịbịa ya bụ njem udo na be ha.

Ọ kọwakwara Naịjria na Gana dịka eze na ire dị n'ime ọnụ. "Mgbe ụfọdụ eze nwekwara ike ịmerụ ire ahụ mana o gbochighị ha ịdị na mma".

Mike kwere nkwa na nke abalị abụọ a ga-amịtara mba abụọ ahụ ezi mkpụrụ.

Nzụkọ ndị omeiwu Naịjriịa na Gana

N'aka ọzọ, ogbo ya nke Naịjirịa bụ Gbajabiamila gosikwara afọ ojuju na nnabata a nabatara ha na Gana ma kwukwa na "ọ rara ahụ ikwu maka Naịjirịa ghara Gana, nke bụ na mba abụọ a dịka ụmụ nne na-ese okwu mgbe ụfọdụ, mana ha ga-emezikwa.

Ka nke a gachara, Gbajabiamila na ụfọdụ ndị ahịa Naịjirịa zutekwara, ebe ha gwara ya na ndị Gana na-enye ha mmekpa ahụ kemgbe 2007.

Nzụkọ ndị omeiwu Naịjriịa na Gana

Onyeisi ndị otu ndị ahịa Naịjirịa na mba ahụ bụ Chukwuemeka Levi Nnaji, gwara Gbajabiamila na ndị otu ya, na ọ bụ ndị Naịjirịa na-akacha ata ahụhụ oge ọbụla e nwere nsogbu na Gana.

O kwuru na ya bụ okwu na-emetụkwa ndị otu ha kwuzuru ụgwọ ụtụisi dịka akwụkwọ iwu mba ahụ kwuru.

Nzụkọ ndị omeiwu Naịjriịa na Gana

Chukwuemeka kwukwara na "ọ bụ n'ezie na ọtụtụ n'ime ha enweghị ike ịkwụli ụgwọ ụtụisi dị otu nde dọla nke mba ahụ dara ha, mana ndị kwụzuru ya bụ ụgwọ na-atakwa otu ahụhụ ahụ".

Ọ sị na ụfọdụ n'ime ha bụ ndị agbachiri ụlọahịa ha anwụọla maka nke a.

Ọ rịọrọ Gbajabiamila na ndị otu ha ka ha biko leba anya na ya bụ okwu n'ụdị ga-enweta udo tọrọ atọ n'etiti mba abụọ a.

Nzụkọ ndị omeiwu Naịjriịa na Gana

Ghana azarala ọnụ ha maka ebubo mmekpa ahụ ụmụ Naịjirịa bi na mba ahụ

Gọọmentị mba Gana ebiputala akwụkwọ ozi bụ nke kapịara ebubo niile Naịjirịa boro ha ọnụ.

Minista mgbasaozi mba ahụ bụ Kojo Oppong Nkurumah bụ onye tinyere aka na ya bụ akwụkwọ kwuru na Gana ga-eme ihe niile ha nwere ike ịhụ na mba abụọ ahụ eseghị okwu.

Mana Nkurumah weere ebubo niile ahụ kọwa ha otu otu, na-ekwu na eziokwu atọgbọghị n'ime ha ma ọlị ma ọlị.

Ọ gbaruru ihu maka otu ogbo ya nke Naịjirịa sịrị zipu akwụkwọ ozi izu gara aga bụ ebe ọ nọ sị na Naịjirịa agaghịzị anabata ụdị mkparị ahụ n'aka ndị Gana ọzọ.

Ọ sị na ya bụ agwa abụghị etu nwanne na nwanne kwesiri isi ịgwa onwe ha okwu.

O kwukwara na ọnweghị ka ha siri megide iwu mmekọrịta nke Vienna convention.

Kojo kọwakwara na ụlọ abụọ ahụ Lai Muhammed sị na ndị Gana napụrụ ndị Naịjrịa abụghị eziokwu.

Ọ sị na ụlọ nnọchite anya Naịjriịa dị No 10 Barnes Road Accra abụghị ụlọ gọọmentị, kama ọ bụ ụlọ mmadụ nkịtị aha ya bụ Thomas D Hardy, nke gọọmentị Naịjirịa kwụrụ ụgwọ ma biri n'ime ya kemgbe afọ 1959, mana ego ha kwụrụ n'isi ya bụ ụlọ agafeela kamgbe afọ iri anọ na isii gara aga.

Ọ sị na "aka gọọmentị Gana esoghị na nkwekọrịta ya bụ ụlọ".

O kwukwara n'agbanyeghị na ọ bụ Oche Eze ndị nwe ya bụ ala kuturu ụlọ ahụ, na gọomentị Gana ekweela Naịjirịa nkwa ịrụgharị ya.

Ọnọdụ anyị ebe a dị ka ọnọdụ ụmụnne anyị na South Africa - Ndị Naịjirịa nọ Ghana

Onyeisiala mba Ghana Nana Akufo-Addo

Ebe foto si, Getty Images

Gbasara ndị ahịa Naịjirịa a na-akpọchị ụlọahịa ha, Kojo sị na ọ bụ ndị dara iwu obodo gbasara azụmahịa ka ha na-akpochi ụlọahịa ha.

O kwekwara nkwa na gọọmentị ga-elebe anya na ya bụ okwu ịhụ ka ha ga-esi mezie ya.

O kwukwara na ọbụghị eziokwu na Gana chụlara mmadụ narị asatọ na ụma (825) ndị Naịjirịa bido n'afọ 2018 ruo Febụwarị 2019.

Kojo sị na nke ahụ bụ okpotokpo asị, na ọ bụ mmadụ narị asaa (700) ndị ohi, ndị ekperịma, ndị yahoo yahoo na-etinye aka n'ajọ ihe ndị mba ọzọ ka ha chụlara Naịjirịa.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Naịjirịa na-emekpakwa Ghana ahụ site n'ịgbachi okeala ha nke mere ka ngwaahịa si mba Ghana ghara ịbata na Naịjirịa.

Ihe ndị a socha n'ihe ndị a ga-anọdụ ala kparịta ụka wee mara etu a ga-esi kwọọ onye ukwu wara.

'Ozuola bụ na ozuola' - Gọọmeti Naịjirịa

Muhammadu Buhari

Gọọmenti Naịjirịa ewepụtala akwụkwọ ozi ịdọ aka na ntị nye ndị mba Gana maka mmekpeahụ ndị be ha na-enye ụmụ Naịjirịa na-azụahịa ebe ahụ.

Na ya bụ akwụkwọ ha zigeere ndị nta akụkọ, Minista mgbasaozi na omenala bụ Lai Hummamed sị na "ike agwụla ha maka oke mmekpe ahụ na mkpesa sị na mba Gana apụta n'ikpeazụ a. N'ihi ya gọọmenti etiti na-eche ụfọdụ ihe iji mee ka ya bụ mmekpeahụ belata".

Muhammed sị na gọọmentị Niajirịa na ha agụkọ ihe niile ndị Gana na-eme Naịjirịa na ụmụ Naịjria na be ha nke gụnyere ịwere ụlọ nnọchite anya mba Naịjirịa dị na No. 10, Barnes

Road, Accra, Gana bụ nke Naịjirịa bigoro na ya ihe ruru afọ iri ise.

Agbanyeghị na gọọmentị Gana na-ebo na Naịjirịa akwụghị ụkwọ afọ n'ụlọ ha, mana onweghị onye gwara Naịjirịa na ha achọwala ịweghara ụlọ ha.

"Agwa a megidere nkwekọrịta 'Vienna Convention'" dịka Mụhammed kwuru.

Ị kutu ụlọ nnọchite anya Naịjirịa dị na No. 19/21 Julius Nyerere Street, East Ridge, Accra, bụkwa nke megidere otu "convention" ahụ.

Ịchụla ụmụ Naịjirịa bi na mba ahụ na-enweghị ihe ha mere.

Malite na Jan 2018 ruo Feb 2019 ihe karịrị 825 alaala site n'ụdị agwa a.

Imechi ụlọahị ụmụ Naịjrịa.

E mechiela ihe karịrị ụlọahịa 300 na Kumasi ọnwa anọ na 2018 dịka ha kpọchịkwara ụlọahịa ụmụ Naịjirịa karịrị 600 na 2019.

Oke ego ndị gọọmenti Gana tinyere maka ịnwete ikike obibi bụ nke karịri nke ndị Nigeria Immigration tinyere na nke ha.

Ajọ agha mgbasaozi ha na-eme n'isi umu Naịjirịa nke na-ebute mkpọmasị.

Muhammed sị na ọ dị mkpa ịkọwata na agbanyeghị na ihe karịrị nde mmadụ bụ ndị Gana bi na Naịjrịa, ọnweghị onye na-enye ha ụdị nsogbu a.

Ọ rịọrọ ụmụ Naịjirịa nọ ebe ahụ ka ha dere juu, ruwe isi na gọọmentị, agbanyeghị mmekpeahụ niile ha na enweta.

Ụmụ Naijiria nọ Ghana azụ ahịa etiela mkpụ ọzọ maka mgbagbu ha na-enweta n'aka ndị ọchịchịc dị n'aka na mba ahụ.

Ha gwara BBC Igbo na a gbachiri ọdọahịa ọtụtụ n'ime anyị na-agbanyeghị ijizu akwụkwọ a chọrọ'