Chukwuemeka Nwajiuba ekwuola na Waec nke afọ a adịghị iche na nke ndị ọzọ

Chukwuemeka Nwajiuba bụ minista agụmakwụkwọ nke steeti na Naịjiria gwara BBC Igbo na ule Waec nke afọ a adịghị iche na ndị afọ gara aga.

O kwuru na n'agbanyeghi na ọrịa coronavirus na-akpa mkpamkpa n'ụwa ugbua mere ka ọtụtụ ihe ghara ịga n'usoro e si emebu ha, na enweghi etu ihe si gbanwee ma a bịa n'ihe gbasara ule Waec.

N'ihe gbasara nkwado ụmụakwụkwo maka ya bụ ule, Nwajiuba kwuru sị na ụmụakwụkwọ nwere ohere kemgbe ịkwado maka ule a malitere n'ụbọchị Mọnde, 17 nke ọnwa Ọgọst.

O kwuru sị na asambodo ndị nke afọ a ga-enweta enweghi etu o siri dị iche na nke ndị lere ule Waec n'afọ ndị gara aga.

Maka ndị nke mahadum, Nwajiuba kwuru sị na ndị nọ na klaasị nke ọpụpụ ga-eburịrị ụzọ apụ tupu a malite ịnabata ndị ọhụrụ.

Gere ihe o kwuru n'uju ebe a:

Ndị mere akụkọ a bụ Sam Agbaje, Ishaq Khalid na Nnamdi Agbanelo