Etu anụghị isi maọbụ ụtọ nwereike bụrụ ama coronavirus

Aha onyonyo, Isi na ụtọ maka coronavirus

Site Ọnịcha gawa Abakaliki, ndị mmadụ na-ekwu na ha rịara ọrịa nke gụnyere anaghị anụ ụtọ na isi ihe ọbụla.

Uche Nwonwu bụ onye Enugwu gwara BBC Igbo na kemgbe abalị ise ya anụbeghị ụtọ ihe maọbụ isi ihe.

Ọ sị: "Ihe a malitere ubọchị ụka. Dịka ọ na-eme m, ewetere m akpụ nso n'ime m mana anụghị m isi ya."