Physiotherapy: Onye nwere nkwarụ na-agba ọkpụkpụ
Remigius Anaiagbaoso bụ onye nwere nkwaru na nwata site n'ọgwụ agbara ya.
Ihe kacha ewute ya abụghị nkwarụ ọ nwere site na ya bụ ogwụ agbara ya, ka ọ bụ mkpu ndị ọzọ na-eti mgbe nwaanye ya nwaanyị na-agba ha ọkpụkpụ.
Nke a mere Remigius jiri gaa mahadum ga mụta ka esi agba ọkpụkpụ nke Bekee kpọrọ Physiotherapy.
Kemgbe ahụ Remigius meghere ụlọọrụ ebe ọ na-agba ndị mmadụ ọkpụkpụ ma nwekwa ezi na ụlọ bụ ndị ọ na-elọkata anya.
Ndị mere akụkọ a bu Chris Okereke na Chiemela Mgbeahụrụ