Aba Police: 'O nweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti laa n'efu' - Ememanka

Aha onyonyo, 'Onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa'

Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa.

Ọ gwara BBC nke a n'okwu gbasara mwakpo akwakporo ndị mpaghara Ndiegoro n'Aba n'ụbọchị ncheta mwereonwe.

Ndị mmadụ na mpaghara ahụ na-ebo ndị uweojii ebubo ịwakpo nakwa ịgba ụlọobibi ha dị icheiche ọkụ iji bọ ọbọ onye otu ha egburu.

Ememanka kwuru na Okezie Ikpeazụ bụ gọvanọ Abia steeti na ndị uweojii ebidola mkparịtaụka nakwa nyocha banyere okwu a.

"Gọvanọ na onyeisi ndị uweojii na-akpa n'ekwentị kwa elekere maka okwu a" ka o kwuru.

Gịnị mere na Ndiegoro?

Ahịa Obiagu

N'ụbọchị Naịjirịa na-eme ncheta mwereonwe, ndị bi n'ụzọ Okojombo, Anaba, Umuosi na Degema dị na mpaghara Ndiegoro hụsịrị anya.

Dịka ụlọntaakụkọ Naijawatchdog siri kwuo, ndị bi ebe ahụ sị na ndị uweojii wakporo ha gbaa ụlọ ha ọkụ.

Ha kọwakwara na ọ bụ mmegwara ka ndị uweojii bịara ịmegwara ebe ahụ maka ọnwụ onye otu ha n'izuụka gara aga.

BBC Igbo gbara mbọ inweta ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Godfrey Ogbonna n'ekwentị mana ọ zaghị oku a kpọrọ ya.