South Africa Xenophobia: Ndị Naịjirịa bi na South Africa ekeela nkwụcha
Ikechukwu Samson bụ onye Naịjirịa bi na mba Saụt Afrịka ekwuola na ihe ha ji anya ha ahụ na mba ahụ abụghị ihe ga-achụ ha ọsọ.
Samson gwara BBC Igbo na mwakpo ndị Saụt Afrịka na-eme rutere ndị mba ọzọ, mana ọ bụ ndị Naịjirịa ka ọ kacha metụta.