Ndị dọkịnta isi ekwuola na isimgbaka, abụghị mmụọ ọjọọ na-ebute ya
Ndị dọkịnta na ndị ọkachara mara ọrịa metụtara ụbụrụ nke Federal Neuro-Psychiatric Hospital na Yaba, Legos akpọọla oku ka ndị ọrụ ntaakụkọ na ndị na-eme ihe onyonyo na-etinye uche n'ụdị ozi ha na ewpụta banyere ọrịa isi.
Ha kwuru nke na ọgbakọ ha nwere n'ogige ha ụbọchị Tuzde.
Dọkịnta Nworia Chukwudi kwuru na etu ndị ntakụkọ sị akọwa okwu ndị ọrịa isi na-eme ekwesịghị ekwesi n'ịhị na ọ na-eme ka a na asọ ndị ahụ asọ.
N'otu aka ahụ, Dọkịnka Nwakire Chinwe kwuru na ọbụghị ezi okwu na-adịghị agwọ ara maọbụ ọrịa isi agwọ.
Ha dọrọ ndị ihe nkiri Nollywood ọdụ ka ha na-eme nchọpụta tupu ha mee ihe nkiri Metụtara ndị na-arịa ọrịa ụburu iji gbanahụ iduhie ọha mmadụ.