You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Nollywood laghachi n'asụsụ Igbo unu jiri malite' - Vicky Nwogu
Ọkacha n'ihe onyonyo a na-emezi na Nollywood ugbua bụ na Bekee ka a na-eme ya.
Ọ bụ eziokwu na a ka na-eme n'asụsụ Igbo mana ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ndị na-emepụta ihe onyonyo n'asụsụ igbo anaghị etinyezi uchu ịgba mbọ hụ na ha mere ya nke ọma.
N'ihe nkiri a, onye na-eme nkiri na Nollywood bụ Vicky Nwogu gwara BBC Igbo ihe ndị na-ewute ya gbasara ndị na-eji asụsụ Igbo eme nkiri na Nollywood.