Obi adighị ọtụtụ mmadụ mma maka ihe pụtara na ndọrọdọrọ APC Imo
Kemgbe amilitere ndọrọ imeụlọ APC n'Imo steeti odoghị anya ihe ọnọdụ steetị ahụ ga-abụ na ọdịnihu.
Kemgbe ụbọchị asaa onwa asatọ n'afọ 2018 ka aha Rochas Okorocha gbara n'akwụkwọ akụ dị ka onye ga-ebuliri APC ọkọrọta ha na ndọrọndọrọ ọchịchị na mpaghara Imo West.
Obi adịghị ọtụtụ ndị Imo steeti anyị gbara ajụjụ ọnụ mma maka mpụtara ya bụ ntuliaka.
Ichie Mbanaso bụ onye ruburu ọrụ dịka onye ndụmọdụ gọvanọ Imo steeti maka mmepe ahịa sịrị mpụtara ahụ jụrụ akwụkwọ akụkọ maka Okorocha imeri ya "bụ ntulaiaka imeọlụ bụ asị".
Ọ kọwaara BBC Igbo ebe mmiri sị baa na ya bụ opi ụgbọgụrụ.