Imo State: Ihe kpatara anyị gbagharịa Madumere akwụkwọ
Gọọmenti Imo steeti ekwuola ihe mere ha ji aga ụlọikpe mkpegharị ịgbagha mkpebi e kpebiri iweghachite Eze Madumere dịka osote gọvanọ steeti ahụ.
Onye nkwuchiteọnụ gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo, kwuru na ụlọikpe ahụ arụtụghị aka n'ebubo e boro Madumere e jiri chutuo ya, kama, ọkaikpe metụrụ aka naanị na ndị e kpokobara mere nyocha maka nchutu ahụ.
O kwuru na Okorocha enweghị ihe ọbụla o nwere megide Madumere maọbụ ọkaikpe kpere ikpe ahụ, kama na ọ bụ usoro iwu ka ha na-eso.
N'okwu ya, "Ọkaikpe ahụ kwuru na onyeisi oche e jiri kpee ikpe maka nyocha ebubo e boro Eze Madumere gafere oge e nyere mana o kwughi okwu gbasara ebubo e boro Madumere."
"Ndị na-eme mkpegharị a bụ ndị ikpe ahụ metụtara, gọvanọ Okorocha esoghi na ya dịka mmadụ.