Anambra: Onye na-ezu gọọmentị ohi ga-aga mkpọrọ
Gọọmentị Anambra steeti akwala arịrị n'ihi ohi ndị isi ụlọahịa dị iche iche na steeti na-ezu ha nke ruru ijeri naịra.
Okwu si n'ọnụ kọmishọna na-ahụ maka azụmaahịa na steeti ahụ bụ Christain Madubuko na mkparịta ụka ya na ndịisi ụlọahịa akwa dị n'Onicha.
Mgbe BBC Igbo gbara Madubuko ajụjụọnụ gbasara nke a, o kwuru na ọ bụ eziokwu.
Madubuko kwuru na ụzọ ndị a si ezu gọọmentị ohi ego bụ ibipụta akwụkwọ azụmahịa adịgboroja na akwụbataghị ego ha kwesiri ịkwụ gọọmentị.
Ọ gara n'ihu ṅụọ iyi na gọọmentị Anambra ga-eji ndị ha nwụchirila mee ihe ịmaatụ ka ndị ọzọ mụrụ akọ.
O kwuru na a ga-akpọpụ ndị a n'ụlọikpe ma tụọ ha mkpọrọ ruru ha.

Ebe foto si, @randomphotojournal
BBC Igbo kpọrọ ụfọdụ ndị na-azụ ahịa ịjụ ha ajụjụ ọnụ mana ha azaghị.
Kama otu onye na-arụ n'ụlọọrụ mbinye ego akpọrọ Silas kwuru na nke a bụrụ eziokwu na ọ bụ ihe ziri ezi n'ihi na ụtụisi ndịisi ụlọahịa na-ana ndị mmadụ dị ukwuu.
Silas kwuru na ọ bụrụ na-akpọpụ ndị a n'ụlọikpe, hụta na ha daara iwu, na ọ bụ ihe ziri ezi ka tụọ ha mkpọrọ ma ọ bụ taa ha ahụhụ ruru ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:
