You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#BloodontheFlag: Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa egosila obi mgbawa ha
Ndị ọrụ nkiri na Naịjirịa apụtala n'elu soshal midia igosi iwe ha gbasara etu ihe si aga na Naịjirịa, ọkachasị ogbugbu e gburu ndị mmadụ na Platu steeti.
Ọtụtụ ndị nkiri pụtara na Instagram na-eme ihe onyonyo na-egosi na ihe a nwereike ime onye ọbụla.
Ha ji akwara #Bloodontheflag nke pụtara ọbara dị n'ọkọlọtọ Naịjirịa wee na-egosi na ọtụụ ndị mmadụ anwụọla.
Gụnyere ihe onyonyo ha mere, ha na-edepụtakwa etu ọ dị ha n'obi.
Stan Nze dere; "Anyị ekpela ekpere, anyị ebeela akwa, anyị akwafuola ọbara ndị aka ha dị ọcha, ndị anyị hụrụ n'anya anwụọla ma na anyị na-ekwu na ozugo.
"O ruola oge anyị ga-eme ihe. O ruola oge anyị ga-ekwu okwu. Tinye olu gị taa."
Ọ bụghị naanị Stan Nze na-eme ngosi iwe a, ọtụtụ ndị ọzọ esonyekwala.