Onye FRSC suru ụgbọala ya enwetala ikpe ziri ezi

Aha onyonyo, Otu nwoke kọwara etu ndị FRSC si daa iwu ha hibere

Otu nwoke akpọrọ Festus Ijeomah na nwanne ya nwoke gara n'ụlọọrụ ndị FRSC nke e ji 'Road Safety' mara, ebe ha gosipụtara iwe ha maka ụgbọala ya ndị FRSC kpọkasịrị kemgbe afọ 2017.

Mgbe BBC igbo gbara nwoke ahụ ajụjụ ọnụ, o kwuru na ndị 'Road Safety' ji ụgbọala ha kpọkasịa nke ya ma buru ya gawa ụlọ ndị uweojii.

Ijeomah gara n'ihu kwuo na ụgbọala ahụ nọrọ n'aka ndị uweojii otu afọ ebe ndị 'Road Safety' jụrụ ịbịa zara ọnụ ha.

O kwuru na ọ bụ mgbe BBC bịara tinye ọnụ n'okwu ahụ ka ndị 'Road Safety' malitere doziwe ụgbọala ya.