Ara m bụ oke ibu arụ nye m

Aha onyonyo, Ara m bụ oke ibu arụ nye m

Violet J kwuru na ọ nọ n'ụra mgbe ara ya bịara fagide ya n'olu chọrọ ị fagbu ya.

Mana o tiri mkpu ma bilie, ya bụrụ ara ya bịara fachie ya na nkọlọ na-ekweghi ya kuru ume.

Ihe a bụ akụkọ ọtụtụ ndị ụmụnwa nwere ara ukwu na-ahụ.

"Kamgbe ahụ anaghị m eji azụ m, arahụ ụra, kama akụkụ m" dịka Violet kwuru.

O kwuru na ihe ga-egbo nsogbu ahụ bụ ịwa ara ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: