Japan: Masazo bụ nwoke kachasị kaa nka n'ụwa niile

Aha onyonyo, Japan: Mazazo bụ nwoke kachasị ka nka n'ụwa

Enwela nwoke ọhụrụ kachasị kaa nka n’ụwa niile.

Masazo Nonaka sị obodo Ashoro dị na mba Japan dị afọ otu narị na iri na abụọ.

A mụrụ ya n'afọ 1905.

O ka na-aga n'ebe a na-agbatị ahụ ma hụkwa achịcha strọọberị spọnjụ n’anya nke ukwuu.

E nwere mmadụ puku iri isii na asatọ rugoro afọ otu narị ma ọ bụ karịa na mba Japan.