Lee ihe niile ikwesiri ịma maka akpụ ori nwa

Akpụ ori nwa bụ ihe ndị bekee na-akpọ 'uterine fibroid'. Ọ kachasị enye ụmụnwaanyị ndị ojii nsogbu.

O nwere ọtụtụ ihe ndị na akpata ya. Dokịnta Francis Ezenwankwo gwara anyị maka ha. O kwukwara ihe onye nwe ọrịa nwere ike ime iji gbanwe ya.

O kwuru na otu akpụ ori nwa si egosipụta onwe ya bụ:

  • Ọ bụ ọrịa na-eme n'akpanwa ụmụnwaanyị
  • Afọ ya na-ebu ibu karịa otu ọ dịbụ na mbụ maka na akpa nwa ya buru ibu ka o nwere afọ ime
  • O nwere ike inwe afọ mgbu n'okpuru afọ ha
  • Oge nwaanyị ha na-adị agbasị ike karịa otu ọ sị agbabụ
  • Ya na nwoke na-enwe mmekọrịta, ọ na-afụ ha ụfụ
  • O nwekwara ike ime ka nwaanyị nwe isike na ịdị ime. Maọbụ ọ dị ime, ọ pụọ.

Dokịnta Ezenwankwo kwuru na onweghi ihe e nwere ike ibido aka na ọ bụ ya kpatara ọrịa a. Mana o kwuru na ihe ndị a nwere ike ibute ya:

  • Onye ahụ ga-abụrịrị nwaanyị tozuru ịdị ime mụọ nwa.
  • A na-ahụkarị ya na ụmụnwaanyị ruru iri atọ. Nwaanyị na-adịghị ime ọsịsọ nwere ike ikpata ya.
  • A na-ahụkarị ya na ụmụnwannyị ndị ojii karịa ụmụnwaanyị ndị ọcha. Nwaanyị ojii niile na-enwe ya, mana ọ bụghị nwaanyị nille ka ọ na-enye nsogbu.Nwankwo kwuru na ndị na-eme research si na ọ nwere ike ịbụ ụdị nrị anyị na-eri na Afrịka. O nwekwara ike ịbụ mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ebute ya.

Ihe onye nwere ya nwere ike ime bụ:

  • Ịlụ dị ma dịkwa ime ọsịsọ
  • Ọ bụrụ na ọ na-enye nsogbu, nwaanyị ahụ nwere ike ị ga ụlọ ọgwụ, awaa ya afọ, wepụ ya. Dọkịnta Nwankwo kwuru na o nweghi ọgwụ ana aṅụ iji agwọ ya. Kama ọgwụ ndị ahụ ga-ebute nsogbu.

Gee ntị nụrụ ihe niile Dọkịnta Ezenwankwo kwuru ugbua.

Onye dere akụkọ a: Chioma Nkemdilim Daramola

Akụkọ ndị ga-amasị gị: