You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Komla Dumor 2018: Ịchọpụta onye ntaakụkọ pụrụiche na mba Afrịka
Ụlọọrụ BBC na-achọ ọpụrụiche na-awapụta ma na-eto eto n'ọrụ ntaakụkọ maka nturuugo mbaụwa nke Komla Dumor BBC na-eme nke afọ 2018.
A na-akpọku ndị ọrụ ntaakụkọ na mpaghara Afrịka niile ka ha tinye akwụkwọ maka nturuugo ahụ nke na-achọpụta ma na-akwalite ndị ọpụrụiche na Afrịka.
Onye meriri ga-arụ n'isi ụlọọrụ BBC na London ka wee mụọ maka ọrụ ntaakụkọ.
Idenye akwụkwọ maka nturuugo a ga-akwụsị ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị afọ a bụ 2018 ma ọ kụọ 12:59 nke ime abalị.